lhe ogugu naN ughari uche Copyright@ St Paul Publications, Nigeria, 2015 Bajbt,JI NsQ, Nhazi KatQlik. Email: [email protected] EDITORIAL AND PRODUCTION TEAM Rev Fr. James Edeh, SSP Coordinator Br. Valentine Obumkaneme, SSP Editor Br. Michael Muogbo, SSP Associate Editor Br. John Okoh, SSP Member Br. Sixtus Onuoha, SSP Member CONTRIBUTORS JAN Fr. FrancisAgu FEB Fr. ChibuikeUwakwe MAR Fr. Donatus Okeke APRIL Fr. Valentine Wayase MAY Br. Augustine Onyeji, Hffby JUNE Fr. Augustine Obiagbaosogu JULY Fr. Martin Obasi, SSP AUG Br. Valentine Obumkaneme, SSP SEPT Fr. Paul Edeh OCT Fr. Nnamdi Agbo NOV Fr. Paul Uche DEC Fr. Benedict Okolo Cover Design: Br. Muogbo Michael, SSP Layout: Br. Sixtus Onuoha, SSP DISTRIBUTED BY: St Paul Book Centre, Oke Padi, Dugbe, IBADAN Tel: 08078194450, 07062631817, email: [email protected] St Paul Book Centre, Holy Ghost Cathedral, Ogui Road, ENUGU Tel: 08078194454, email: [email protected] St Paul Book Centre, Catholic Institute of West Africa, PORT HARCOURT Tel: 08100033655, email: [email protected] Society of St Paul, Oremeji Street, LAGOS Tel: 08078194452, [email protected] Pauline Book and Media Centre, 2 Amore Street, lkeja, Lagos Tel: 08066632310, email: [email protected] Printed by Brilliant Printers Pvt. Ltd. and published by ST PAUL PUBLICATIONS, Ibadan, Nigeria 2021 N'akwukwo ozi nke Pope Francis dere "Aperiut lllis", mere k'anyi mata mkpa odi iji akwukwo ozi nke bu okwu chineke n'aka oge niile, biakwa mee k'oburu ihe anyi ga na ebiputa na ndu anyi. 0 ga enyere anyi aka ighotawanye akwukwo nso nke oma, ma obughi otua mmuo anyi ga aju oyi. N'otu aka akwukwo a bu "lhe ogugu na Ntughari Uche" ga enyere anyi aka ino nso ma na atughari uche na okwu nke Chineke, mekwaa ka mmuo anyi di oku ma buru kwa ihe igba ume ebe ndi otu Christ no. Oga abu ihe mara mma ma ya bu okwu Chineke rute ndi ozo aka. Ndi otu St Paul nke ngalaba obodo Nigeria, iji were ruputa oru ejiri mara ha, nke onye wubere ya bu James Alberione, hanyere ha n'aka ji obi anuri n' ebiputa akwukwo izizi nke asusu lgbo na afo 2021. 0 bu maka iji nyere ndi mmadu aka site n'efem Chukwu na ebe Jesu no na Eucharistia no. Akwukwo a gunyekwara ihe ogugu ubochi nile, ekwe azaa na mbeku nke Ozioma. Anyi ji ohere a ekele ndi niile nyere anyi aka okacha ndi dere ntughari uche na ndi nyere aka ifu na orutere mmadu niile aka. Otu aka ahu ka anyi ji ekele Fr. Siji Jose, SSP, Fr. Joseph Kamdachamkunnel, SSP na Fr. Gerard Tanko, SSP maka atumatu na njem ha gara ihu na akwukwo a bu ihe obu. Na ekele kwa Fr James Edeh, SSP maka ezigbo nhazi ya. Otu aka ahu ka anyi ji ekele Fr. Shinto Joseph,SSP na Fr Francis Xavier,SSP maka ndumodu ha nyere onye haziri ime akwukwo a bu "lhe Ogugu na ntughari Uche" Edishion nkea. Na ekele kwa Michael Muogbo, SSP, Sixtus Onuoha, SSP, John Okoh, SSP na Augustine Onyeji, Hffby ndi luru oke oru iji hu na akwukwo a putara nke oma. Na mmechi, anyi jikwara ohere a ekele Jesu bu Uzo, Ndu na Eziokwu maka odudu na enyemaka ya di okpu. Na Nne ya bu Ezenwanyi ndi Ozioma onye na ariotara anyi aririo oge niile. Anyi na asi ka Chukwu gozie ma Chekwaba onye obula nkeji akwukwo a efeya. Br. Valentine Obumkaneme, SSP Onye Nchikota Blessed James Alberione Founder of the Pauline Family Name: ................................................................................................................ .. Residence Address: ............................................................................................ . Tel: ....................................................... Fax: ....................................................... . Mobile: ................................................ E-mail: ................................................. .. Office Address: ................................................................................................... . Tel: ...................................................... Fax: ....................................................... .. Mobile: ............................................... E-mail: .................................................. .. Passport No: ....................................... Expiry: .................................................. .. Driving License No: ............................ Expiry: ................................................... . Vehicle Registration No: ..................................................................................... . Insurance Policy: ................................. Renewal: .............................................. .. In case of emergency: Notify: ................................................ Relation: ................................................ .. Address: .............................................................................................................. . Phone: ............................................... Mobile: ................................................... . Oriri Maria di Aso Nne nke Chukwu Onuogugu 6:22-27 Dinwenu gwara Mosis sl: "Lee ihe i ga-agwa Eron na umu ya: "Otu aka unu ga-esi na-agozi umu lzrel. Gwa ha si: Ka Dinwenu gQzie unu chegidekwa unu. Ka ihe nke Dinwenu chakwasa unu; ka O nyekwa unu amara Ya. Ka Dinwenu chee unu ihu, biakwa wetara unu udo. "Otu a ka ha ga-esi kpodata aha M n'isi umu lzrel, ewere M gozie ha." Abu 66:2-3, 5,6,8, Az. 2 Chineke, biko meere anyi ebere gozie anyi. Chineke, biko, meere anyi ebere, mekwa ka ihe nke ihu Gi chakwasa anyi, ka e were mata uzo Gi n'uwa. Mba nile abiakwa nweta enyemaka nzoputa Gi. Az Ka mba nile nuria na-egorikwa n'ihi na iji ikpe nkwumoto na-achi uwa, jirikwa ezi obi na achi ndi mmadu. Obu Gi na-edu mba nile n'uwa. Az Dinwenu, ka ndi mmadu too Gi, ka mmadu nile nye Gi otito. Ka Chineke nogide na-enye anyi ngozi Ya ruo mgbe mba nile ga-aturu Ya egwu.Az Gal4:4-7 Mgbe oge ahu a kara aka zuru, Chineke zitere Nwa Ya, Onye nwanyi muru; Onye a muru n'okpuru iwu, ka 0 wee gbaputa ndi nQ n'okpuru iwu, biakwa mee anyi ndi e jiri mere um4. lhe na-agba akaebe na unu bu umu n'ezie, bu na Chineke zitere Mmuo nke Nwa Ya n'ime obi anyi; o b1,1 Mmuo ahu na-eti mkpu na-asi: "Abba! Nna!" 0 bu Ya na-eme ka i buru nwa n'ezie. I bukwaghi ohu ozo. Ebe Chineke merela ka i buru nwa Ya, o putara na i burukwala onye ga erite oke a na-ekenye umu. Mbeku: N'oge gara aga, Chineke siri n 'onu ndi amuma gwa nna nna anyi ha okwu. Man 'age ugbu a, 0 sin 'onu Nwa Ya agwa anyi okwu. Luke 2:16-21 Ndj nche aturu ji oso na ije gawa Betlehem. Ha huru Mariana Josef na Nwata ahu ka 0 dina n'ihe eji etinye nri anu ulo. Mgbe ha huru Nwata ahu, ndi nche aturu akokwa ozo ihe a gwara ha banyere Ya. Akuko ndj nche aturu turv onye o bula nuru ya n'anya. Mana Maria chiiri okwu nile ndi a, wunye n'obi ya, na-atugharikwa ha n'obi ya. Mgbe ndi nche aturu na alaghachi, ha na-aja Chineke mma, na-etokwa Ya, maka ihe nile ha mrr4 na ihe nile ha huru. lhe ha huru bu kpomkwem ihe a gwara ha. N'ubochi nke asato ya, mgbe oge zuru maka ibi Nwata ahu ugwu, aha a guru Ya bu Jesu; nke bu aha Mmuo ozi nyere Ya tupu a di ime Ya. Ntughari Uche Mgbe ahu echere n'oriri anya adighi ka Chineke na emere ndi nke ya amara di egwu. O gosiputara nkea mgbe o siri Moses ka o gwa Aaron otu 0 ga na-esi agozi ndi nke ya maka nchekwaba, ogologo ndu na ahu isi ike.Ngozi nke Chineke a putara ihe n'ebe Nne anyi di Nso bu Vegi Maria noo. Chineke mere ya ihe oma site n'ibuni ya elu karicha ndi Umunwanyi niile. O si n'afo ya wee muputa Jesu Kristi bu onye nzoputa nke uwa niile. Muozi nke Chineke nonyere ya, na edu ya, na agbazirikwa ya n'uzo niile nke ndu ya.Jesu n' akpo ndi niile bu ndi n'enweghi oriri anya ozo oku ka ha nwe ndidi n'ihi na oge ngozi Chineke di nso. Basil the Great and Gregory Nazianzen, bps, drs M 1Jon2:22-28 Onye bu onye ugha? 0 bu onye na ekwu na Jesu abughi Kristi. Onye di otu a bu onye na-emegide Kristi. Ona agonari Nna na Nwa. Onye obula na agonari Nwa, enweghikwa Nna n'ime ya. Onye ah1,1 nke na-ekwuputa Nwa, na-ekwuputakwa Nna. Meenu ka ihe unu nuru na mbido biri n'ime unu. 0 buru na ihe unu nuru site na mbido ebiri n'ime un4, mgbe ahu, unu ga-ebi n'ime Nwa na n'ime Nna. Nke a bu nkwa o kwere anyi, ndu ebighiebi. Ana m edere unu nke a maka ndi ga-eduhie unu. Otite mmanu nke unu siri n'aka ya nweta na-adi n'ime unu, o dighikwa mkpa ozo na onye obula ga-akuziri unu. Ebe o bu na otite mmanu ya kuziiri unu banyere ihe niile, o bu ezie, o bughi ugha. Ebe o bu eziokwu, nogidekwanu n'ime ya. Ugbu a umu ntakiri, nogidenu n'ime ya, ka o ga-abu mgbe o putara ihe, anyi enwee ntukwasiobi, ghara iji ihere puo n'ihu ya mgbe o ga-abia. Abu: 98: 1, 2-3, 3-4. Akuku uwa niile ahl,Jla nzopl,Jta nke Chineke anyi. Kweere Onyenweanyi ukwe ihuru, n'ihi na o ezinuulo lzrel no. Az ruru oru ebube, aka nri ya na aka ya di nso Akuku uwa niile ahula ewetarela ya mmeri. Az nzoputa nke Chineke anyi. Onyenweanyi egosila ike nzoputa ya, 0 meela Uwa niile tieren1,1 Onyenweanyi ka mba niile mata eziomume ya. 0 chetala mkpu onu. Were ukwe na mkpu ihunaanya ya na ikwudosiike ya n'ebe onu too ya Az Mbeku: Okwu ahu buuru mmadu wee binyere anyi. Mandi niile nabatara ya, ka o nyere ike ibu umv nke Chineke. Jon 1: 19-28. Nke a bu akaebe nke Jon gbara; mgbe ndi Juu siri na Jerusalem zigaara ya ndi nch1,1 aja na ndi Levai, ka ha juo ya si, "Onye ka i bu? Jon kwuru eziokwu, 0 goghi ago, kama o kwuputara si, "Abughi m Kristi ahu." Ha juru ya si, "Onyezi ka i bu? I bu Elaija?" Jon zara si, "Abughi m ya." Ha jukwara ya si, "I bu onye am1,1ma ahu?" 0 zara si "Mba." Ha siri ya, "Onye ka i bu?" Gwa anyi ka anyi nwee ihe anyi ga-agwa ndi zitere anyi. Gini ka I nwere ikwu banyere onwe gi?" O siri, "Abu m olu nke ahu na-eti mkpu n'ime ozara si, "Meenu uzo nke Oseburuwa ka o kwuru oto, dika onye amuma Aizaya siri kwuo." Ha bu ndi, ndi Farisii zitere. Ha juru ya si, "Gini mere I ji eme ndi mmadu mmirichukwu ma o buru na i bughi Kristi ahu ma o bu Elaija, I bughikwa onye amuma ahu?" Jon zara ha si, 'Eji m mmiri eme mmirichukwu ma otu onye no n'etiti unu, onye unu na-amaghi. 0 na-esochi m n'azu, onye mu na-etosighi ike itoghe eriri akpukpoukwu ya." lhe a mere na Betani n'ofe Jodan, ebe Jon no na-eme mmirichukwu. Nwata ahu ugwu, aha a guru Ya bu Jesu; nke bu aha Mmuo ozi nyere Ya tupu a di ime Ya. Ntughari Uche Umu nke Chineke kwesiri i bu ndi eji umeani were mara. Otutu ndi mmadu na aju Jon Onye n'eme mmirichukwu ajuju ka ha mara onye obu nakwazi ihe o biara ime n'uwa. Na agbanyeyi onyinye niile juputara ya ahu, o kwuru na ya abughikwa onye nzoputa ka ma o biara ikwado maka obibia Kristi. Jon gosiri nke oma na ihe niile o nwere si n'aka Chineke were bia maka iji wee na alu oru. 0 bu oru diri anyi iji umeani n'alu oru nke Chineke wee mata n'obu nani Chineke n'enye onyinye nke Muonso anyiji alu oru ebube di iche iche. Epifani Aizaya 60:1-6 Kulite! chawaputa; maka na ihe gi abiala. Ebube nke Onyenweanyi na-awalitere gi. 0 bu ezie na itiri gbachiri uwa nile, ochichiri ka kpuchikwara ndi mmadu, ma ebube nke Onyenweanyi na-awalitere gi. Ugbu a Onyenweanyi awalitela n'elu gi. Ebube Ya aputala ihe n'elu gi. Mba di iche iche na-abia n'ihe gi. Ndi eze na-abiakwa n'ihe gi nke na-amukesi n'uzo ututu. Welite anya gi legharia n'ebe nile. Mmadu dum na-ezukota, na-abjakwute gi. Umu gi ndi nwoke si n'ebe di anya abia. E jikwa nwayoo kuru um4 ada gi n'aka na-abia. Mgbe i huru ihe ndia, ihu gi ga-abu so ochi. Mgbe ahu, obi gi ga ejuputa n'anuri, na-awulikwa elu n'onu, n'ihi na aku na uba ga-esi n'osimiri na-enubatara gi ka mmiri. Aku na uba nke ndi mba ozo ga na-abiakwutekwa gi. lnyinya ibu ga na-enubatara gi n'igwe, n'igwe. Udi inyinya ibu di iche iche nke ndi Midia na lfa ga-agba gi gburugburu. Onye o bula bi na Sheba ga-ebute olaedo na mgba isi oma, kwere ukwe otito nke Onyenweanyi na-abia. Abu 71:1-2,7-8, 10-13 Az.11 Onyenweanyi, mba dum ga-ada n'ihu Gi, gbuoro Gi ikpere ala. Biko Chineke, were ikpe nkwumoto Gi nye eze. Nyekwuo nwa eze ezi omume Gi. 0 ga-eji ikpe nkwumoto chjkwaba ndi nke Gi; bjakwa kpeziere ndi a na-emegbu emegbu ikpe. Az N'ogeya, ezi omume ga-epuputa dika ahihia di ndu. Udo ga-adigide ebe niile ruo mgbe ebighi ebi. 0 ga-esite n'oke o simiri chiruo ochjchj n'oke osimiri ozo; bjakwa site n'oke osimiri chiruo ochichi n'ebe uwa kwusiri. Az Ndi eze si Tashish na ofe osimiri ga-abia tuoro Ya mma mma. Eze ndi Sheba na Seba ga-ebutere Ya onyinye. Eze nile di n'uwa ga-egbu ikpere ala n'ihu Ya. Mba dum ga-agbara Ya odibo. Az O ga-agbaputa nwa ogbenye ahu na-etiku Ya. O ga-agbaputakwa onye ahu a na-emegbu emegbu, onye na-enweghi onye enyemaka. 0 ga-emere ndi no na mkpa na um4 ogbenye ebere. Oga azoputakwa ndu um4 ogbenye. Az E us 7- , -6 O were m anya, na unu anula na Chineke, site n'amara Ya, enyela m oru ilekota ezi na ulo Ya maka odimma unu. Eleghi anya, unu anukwala na Chineke kpugheere m ihe omimi na-izu-nzuzo Ya, mee ka m mata ha, dika m dere nwantinti na mbido akwukwo ozi nke a. lhe ahu a na-ekweghi ka ndi mmadu mara n'oge gara aga, bu ihe Mmuo Nso kpugheere ndi Umuazu na ndi amuma Ya di nso n'oge nke anyi. lhe omimi ahu bu nke a: N'ime Jesu Kristi, ndi mba ozo na ndi Juu so nwere oke di n'ulo Chineke; na ha soro ndi Juu buru akuku otu ahu Jesu Kristi ahu; na ha sokwa keta oke na nkwa ahu e kwere site n'ikwusa Ozioma. Mbeku: Anyi ht,m,i kpakpando Ya mgb e o walitere. Anyi wee bia, isekpuru Onyenweanyi. Matiu 2:1-12 Mgbe a muru Jesu na Betlehem nke Judia, mgbe eze Herod na-achi, ndi amamihe na-akowa kpakpando siri n'owuwa anyanwu biaruo Jerusalem. Ha wee juo si: "Olee ebe 0 no, bv Nwa ahu a mur4 ohwv. ka o buru eze ndj Juu? Anyi huru kpakpando Ya n'owuwa anyany4 wee bia ikporo Ya isiala. Ma mgbe eze Herod nuru ihe a, obi loro ya na ndi bi na Jerusalem mmiri. Herod wee kpokota ndi isi nchuaja na ndi nkuzi iwu Mosis nile, wee juwa ha ebe a ga-amu Kristi. Ha wee si ya: "Na Betlehem nke Judia," n'ihi na otu aka onye amvma si dee ya: "Gi bu Betlehem, di n'ala nke Juda, i bughj nwa nke ntakiri na ndi na-achi achi na Juda. N'ihi na onye ndu ga-esi na gi puta. Onye ga-azv ndi nke M bu lzrel dika aturu." E mesia, Herod kpooro ndi okasimara ahv na nzuzo weejuta ha nke oma banyere age kpakpando ahv putara ihe, 0 wee ziga ha Betlehem, gwakwa ha, si: "Jeenu, ch9putanu Ya, ziterenv m ozi ka m biakwuo, sekpuruo Ya." Mgbe ha nusiri ihe eze kwuru, ha bilie gawa. Ka ha na-eje, ha hvkwara kpakpando ahu ha hur4 n'owuwa anyanwu. 0 putakwara ozo, na-aga n'ihu ha. 0 wee gagide ruo age o biara kwvrv n'elu ebe Nwata ahv no. Mgbe ndj amamihe ahv hur4 kpakpando ahu, ha nuriri oke onv. Ha wee banye n'ime ulo, hu Nwata ahv na nne Ya bu Maria. Ha dara n'ala, gbuoro Ya isiala na ikpere ala. Ha meghere akpa ha, nye Ya onyinye: nke bv Olaedo, na mgba oke isi oma, (a na-akpo frankincense) na ude nnukwu isi oma (a na-akpo myrrh). Ha mesia si uzo ozo laa ala ha, n'ihi na ozi ha natara na nro doro ha aka na ntj, ka ha ghara ilaghachi na be Herod. Ntughari Uche Otutu ndi mmadu no n'ime ochichiri nke mere na agam n'iru adighizikwa ozo. Nkea mere otutu jiri egwughari n'ime njo di iche iche n'ihi na mmuo ha kwere ekwe n'ezie mana anuahu adighi ike. Taata, Chineke na akpo anyi oku k'anyi si n'ime ochichiri puta n'ihi na ihe nke Chineke abia goo nso. Obu ihe nke Chineke a na eme nwa Ogbenye ya aburu nwa Ogaranya, mee onye aria o nweta ogwugwo nso, nwanyiaga o wee kuru ejima. K'anyi yoo Chineke ka onyere anyi aka i mata ihe nke ya ka owee diri anyi nfe i hapu agburu nke ochichiri. Monde na-eso Epifani • lJon 3:22-24.4:1-6 Anyi na anata n'aka ya, ihe obula anyi na-ario, n'ihi na anyi na-edobe iwu ya na-emekwa ihe na-amasi ya. Nke a bu iwu ya; na anyi ga-ekwenye n'aha nke Nwa ya bu Jesu Kristi ma huritakwa onwe anyi n'anya dika o si nye anyi na iwu. Ndi niile na-edobe iwu ya na-ebi n'ime ya, ya onwe ya na-ebikwa n'ime ha. N'uzo di otu a, anyi na-ama na obi n'ime anyi, site na Mmuo nke o nyere anyi. Ndi m huru n'anya, unu ekwenyela mml,Jc;> niile, kama nwaleenu mmuo niile ka unu choputa ma ha bu mmuo nke Chukwu. N'ihina otutu ndi amuma ugha ejuputala n'ime uwa. Otu a ka unu ga-esi mata nke bu mmuo Chineke. Mmuo obula nke na-ekwuputa na Jesu Kristi biara n'udi mmadu bu mmuo nke Chineke. Nke na-anaghi ekwuputa Jesu Kristi abughi Mmuo nke Chineke. Nke a bu mmuo nke onyeiro Kristi, nke unu nurula na o na-abia, ugbu a, o norolari n'uwa. Umuntakiri, unu bu ndi nke Chineke, unu emerikwaala ha; n'ihina onye no n'ime unu kariri onye ahu nke no n'uwa. Ha bu ndi nke uwa, ihe ha na-ekwu bu nke uwa. Uwa na-egekwa ha nti. Anyi bu ndi nke Chineke. Onye obula maara Chineke na-ege anyi nti. Onye na-abughi onye nke Chineke anaghi ege anyi nti. Site n'uzo di otu a, anyi ga amata Mmuo nke eziokwu na Mmuo nke ugha. Abu: 2:7-8, 10-11 Aga m enye gi mba niile, ka ha buru nke gi. Onyenweanyi gwara m si, I bu nwa m, taata A burula m nna gi Rio m aririo, aga m enye gi mba niile, ka ha buru nke gi: ka akuku uwa niile bl,Jrl,J ebe ochichj gi.Az Ya bu ugbu a, unu ndi eze, mutanu ako, ndi ochichi nke uwa, kpacharanu anya. Febenu Yahweh, tuba nu ya egwu; maanujijiji n'ihu ya, ma susuo ukwu ya onu.Az Mbeku: Ndi bin 'ochichiri a hula oke ihe. /he achakwasila ndi bi na ndagwurugwu onwu. Matiu 4:12-17, 23-25. Mgbe Jesu nuru na ejidela Jon, 0 laghachiri Galili. 0 hapuru Nazaret, gaa biri na Kapanaum nke di n'akuku osimiri di n'oke ala Zebulum na nke Naftali. Nke a bu iji mejuputa ihe onye amuma Aizaya kwuru si, "Ala Zebulum na ala Naftali, nke di n'akuku Osimmiri, n'ofe nke Jedan, Galili nke ndi mba ozo. Ndi bi n'ochichiri ahula oke ihe. lhe achakwasila ndi bi na ndagwurugwu onwu." Site n'oge ahu Jesu malitekwara ikwusa ozioma si, "Chegharianu, n'ihi na alaeze eluigwe adila nso. Jesu na-agaghari na Galili niile na-akuzi ihe n'ulo nzuko ha, na-ekwusakwa ozioma nke ala eze Chineke. 0 gwokwara ndi mmadu oria na nrianria ha di iche-iche. Ude Jesu gbasara n'ala Judi a niile nke na ndi mmadu na-akpotara ya ndi niile ahu na-adighi ike, ndi oria na ahu mgbu di iche-iche. Ha kpotaara ya ndi ajo mmuo ji, ndi akukwu na-ado na ndi akuku ahu ha kponwuru akponwu. Jesu gworo ha niile. Oke igwe mmadu siri na Galili, Dekapolis, Jerusalem, Judia na ofe Jedan sore Jesu. Ntughari Uche Ebe obula Jesu batara, ochichiri agba oso. Onye obulana-egwughari n'njo, m'obu anaghi edobe iwu nke Chineke no n'ime ochichiri. N'ihi nke a, anyi niile no n'ochichiri. Jesu na gwa anyi taata ka anyi chegharia wee si n'ochichiri banye n'ihe.